Genesis 49

Jekọb agọzie ụmụ ya

1Mgbe ahụ, Jekọb kpọkọtara ụmụ ya ndị ikom niile nʼotu sị ha, “Zukọọnụ ka m gwa unu ihe ga-adakwasị unu nʼụbọchị dị nʼihu.

2“Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb
nụrụ okwu nna unu Izrel.

3“Ruben, ọkpara m ka ị bụ,
ume m, ihe ngosi mbụ nke ike m,
onye nsọpụrụ kwesiri, onye mbụ nʼịdị ike.
4Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ,
nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị,
i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya.

5“Simiọn na Livayị bụ ụmụnne.
Mma agha ha bụ ngwa ihe ike.
6Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha,
ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha,
nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha,
bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche.
7Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ.
Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke.
Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb
Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel.

8“Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị.
Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị.
Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị.
9Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda,
i si nʼịchụ nta lọta, nwa m.
Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala,
dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya?
10Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya,
maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ,
tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa,
irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya.
11Ọ ga-ekenye ịnyịnya ibu ya nʼosisi vaịnị,
nʼalaka kachasị mma ka ọ ga-ekenye nwa ịnyịnya ibu ya.
Nke a na-egosipụta ịba ụba nʼebe ọ dị ukwuu, maọbụ mmadụ ịbụ ọgaranya.

Ọ ga-asakwa uwe ya na mmanya.
Uwe mwụda ya ka ọ ga-asụkwa nʼọbara mkpụrụ vaịnị.
12Anya ya ga-acha uhie uhie karịa mmanya vaịnị.
Eze ya ga-enwupụkwa ọcha karịa mmiri ara ehi.

13“Zebụlọn ga-ebi nʼakụkụ osimiri.
Ọ ga-abụ ebe izuike nye ụgbọ mmiri.
Oke ala ya ga-agbatịpụ ruo Saịdọn.

14“Isaka dị ike dịka ịnyịnya ibu
na-amakpu nʼetiti ọgba atụrụ.
15Mgbe ọ hụrụ otu ebe izuike ya si dị mma,
hụ otu ala ya si maa mma,
ọ ga-ehudata isi ya ibu ibu arụ;
were onwe ya nye ịrụ ọrụ ike.

16“Dan ga-eme ka ikpe ziri ezi rute ndị ya aka
dịka otu nʼime ebo Izrel.
17Dan ga-adị ka agwọ dị nʼakụkụ okporoụzọ,
dịka ajụala dị nʼụzọ ọhịa,
nke na-ata ịnyịnya nʼikiri ụkwụ,
si otu a mee ka onye na-agba ịnyịnya dalaa azụ.

18“O Onyenwe anyị, ana m ele anya nnapụta gị.

19“Gad bụ onye usuu ndị o-ji-egbe-aga ga-abịakwasị,
ma ọ ga-alụso ha ọgụ, chụọkwa ha ọsọ.

20“Asha ga-esi nʼubi ya wepụta nri gbara abụba,
nke na-adị ndị eze mma.

21“Naftalị dịka nne ele a hapụrụ ahapụ,
nke na-amụpụta ụmụ ele mara mma.

22“Dịka osisi vaịnị a kụrụ nʼakụkụ iyi,
nke alaka ya na-awasa rigoro nʼelu mgbidi,
na nke na-amị ezi mkpụrụ, otu a ka Josef dị.
23Ndị na-agbata ụta sitere nʼobi ilu lụso ya agha,
ha gbara ya àkụ site nʼịkpọ asị.
24Ma aka o ji jide ụta nke ya adaghị mba,
ike agwụghị ogwe aka ya,
nʼihi aka Onye dị ike nke Jekọb,
nʼihi Onye ọzụzụ atụrụ, Oke Nkume Izrel,
25nʼihi Chineke nna gị, onye na-enyere gị aka,
nʼihi Onye pụrụ ime ihe niile, ka ọ gọzie gị,
site na ngọzị nke eluigwe site nʼelu,
ngọzị nke osimiri dị nʼokpuru ala,
ngọzị nke ara na akpanwa.
26Ngọzị niile nke nna gị, dị ukwu karịa,
ngọzị niile nke ugwu ukwu mgbe ochie,
karịakwa ngọzị nke ugwu nta mgbe ochie,
Ka ngọzị ndị a dị iche dịkwasị nʼisi Josef,
dịkwasị nʼegedege ihu Josef, onye bụ onyendu nʼetiti ụmụnne ya.

27“Benjamin dịka nkịta ọhịa nke na-adọgbu anụ.
Nʼụtụtụ, ọ na-eri anụ ọ dọgburu.
Nʼanyasị ọ na-ekesakwa ihe o gbutere.”
28Ndị a bụ ebo iri na abụọ dị nʼIzrel. Ihe ndị a bụkwa ihe nna ha gwara ha mgbe ọ gọziri ha, nye onye ọbụla nʼime ha ngọzị nke ruuru ya.

Ọnwụ Jekọb

29Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het. 30Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu. 31Nʼebe ahụ ka e liri Ebraham na Sera nwunye ya. Nʼebe ahụ kwa ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya. Nʼebe ahụ ka m liri Lịa. 32Ebraham nna nna m zụrụ ala ahụ na ọgba dị nʼime ya site nʼaka ụmụ Het.”

33Mgbe Jekọb kwuchara okwu ndụmọdụ ikpeazụ ndị a nye ụmụ ya ndị ikom, ọ chịkọtara ụkwụ ya nʼelu akwa, kuo ume ikpeazụ. A chịkọtara ya na ndị ya.

Copyright information for IboBIU